EKWE Volume 19 Number 1 2026

NDỊ IGBO NA USORO ỊKPA AKỤNAỤBA N’OGE UGBUA A: MMETỤTA NA NKWALITE ỤZỌ OCHIE. USORO ỌHỤRỤ NDỊ A TUPU AGHA BỊAFRA (A SEMINAR PAPER PRESENTATION)

Ejimofor, Patience Oledimma
Abstract

Nchọcha a lebara anya n’omenaala ndị Igbo dịka o siri metụta usoro ịkpa akụnaụba ha n’oge ugbu a, ma ebe nlekwasi anya bụ karịchaa n’ebe ọ gbasara mmetụta na nkwalite usoro ịkpa akụnaụba ndị Igbo n’oge ochie/gboo tupu agha Bịafra. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ụzọ dị iche iche ndị Igbo siri kpaa akụnaụba tupu agha Bịafra. Ihe mere ụzọ ndi ahụ mgbe agha Bịafra biri. Nchọcha a kere ụzọ ndị Igbo si akpa akụnaụba tupu agha Bịafra ụzọ isii ndị a: ọrụubi, nka na akaọrụ, ahuike, azụmahia, ịchọmma na ihe mmepụta gasị. Nchọcha a gbasoro atụtụ usoro nchụta akụ nke sitere n’aka Karl Marx. Ọ na-akọwa na agụmagụ bụ ngosipụta ọdịdị nchụta akụnaụba nke obodo. Atụtụ a na-esi agụgọ na etu a pụrụ ịghọta agụmagụ obodo bụ iji ya tụnyere etu ndị obodo ahụ si agbaso nchọta akụnaụba, ya bụ etu onye ọ bụla si na- agbalị na-azọta ihe ọ ga-eri n’ụwa akụezuoke. Ngwa e ji mee nchọcha a gụnyere akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche ndị e wetara n’ọbọ akwụkwọ dị iche iche tinyekwara ndị nke e nwetara na intaneti, nguzobe nnyocha na ajụjụ ọnụ. Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụko anya na ndị Igbo bụ ndị na-arụsi ọrụ ike malite na ntọala nke ụwa. Ma etu ndi ọgbọ dị ugbu a si ahapụzi usoro mkpata akụnaụba ndi gboo bụ ihe mgbawa obi nye ome nchọcha. Mgbahapụ a emenyụola ndi Igbo anya n’uzọ dị iche iche. Ome nchọcha na-akpọ ọku ka ndị Igbo laghachi n’ụzọ ochie e jiri mara usoro ịkpata akụnaụba ha n’ihi na o bụ otu n’ime ụzọ ndị ha ga-eji chekwaa omenaala na ihe nketa nke agbụrụ ha.

Keywords: NA
Copyright © 2026 ACJOL.