Nchọcha a lebara anya na nhazi Mmọnwụ n’Eda’ lgbo. Onye nchọcha rụtụrụ aka site n’ịkọwa na ọ bụ otu n’ịme abamaba e nwere n’ala lgbo. Ọ bụkwa abamaba nnabata ụmụ okorobịa tozuru oke na-eme. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta usoro nhazi Mmọnwụ Eda lgbo nke gụnyere ekike Mmọnwụ, Ihu Mmọnwụ, Mmọnwụ na agbara Egbela Eda. Egbela na nnabata ndị ọhụrụ na Mmọnwụ, ịbi ịsị ugwu, ọrụ Egbela na Mmọnwụ, ịkike Egbela na Mmọnwụ, nsọ Egbela na Mmọnwụ, ọrụ Mmọnwụ bara Eda na ọghọm Mmọnwụ. Onye nchọcha ji ịgba ajụjụ ọnu na nọọrọlere mere ngwa nchọcha ya. Ọnye nchọcha jị atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe nke Lev. Vygosky hiwere n’afọ 1978. Onye nchọcha ji usoro nkọwa tụlee ihe ndị a chọpụtara. A chọpụtara na Mmọnwụ Eda lgbo na-ewere ọnọdụ n’ọnwa ịrị kwa afọ ọ bụla. A chọpụtara uru Mmọnwụ baara ndị Eda, nke gụnyere, ọ na-eme ka obodo na-ekpo ọkụ, e ji ya akwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu. A chọpụtara ọghọm dị na ya, A chọpụtara na tupu a hụta nwoke ọ bụla dị ka onye tozuru oke, ọ ga-esonyeriri abamaba Mmọnwụ na ekpemekpe Egbela Eda, Onye nchọcha tụrụ aro ka nwoke Eda, lgbo na - eme emume abamaba Mmọnwụ kwa afọ ọ bụla, iji kwalịte omenaala, Ọdịnaala, na ọdibendị ha. Onye nchọcha tụkwara aro ka ndị Eda, lebagharịa anya na nhazi Mmọnwụ Eda, iji chọpụta ụzọ ha ga-esi mee ka ọ ghara ichipụ ma ọ bụ laa ka nayị.
Keywords: Mmọnwụ, Eda, Omenaala, Ọdịnaala, ọdịbendị.