Nchọcha a bụ nke lebara anya n'abụ ederede Igbo ụfọdụ ndị a họọrọ wee chọpụta atụmatụ okwu maka mkpụrụokwu na atụmatụ okwu maka ụdaolu ndị odee zipụtara. Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na e kewara atụmatụ okwu ụzọ abụọ. Ọ bụ ihe dị etu a kpalịrị mmụọ onye nchọcha ime nchọcha n'isiokwu a. Ebumnobi nchọcha a bụ ịmata ihe bụ atụmatụ okwu na nkeri abụọ e mere banyere ya n'abụ a tụchara. Ọzọ bụ ileba anya n'etu odee abụ ndị a họọrọ, siri zipụta ha n'abụ. Akwụkwọ abụ e si na ya họọrọ abụ bụ Ụtara Ntị Emenanjọ chịkọtara. E si n'akwụkwọ abụ a, họrọ abụ abụọ nke J. Chukwu Madụekwe dere ọ kpọrọ 'Ihe Egwu Anyị' na 'Ji' wee mee ntụcha maka isiokwu nchọcha a. Nchọcha a bụ ụdị nchọcha nkọwa ebe atụtụ nchọcha a bụ atụtụ ọdịdị na-eleba anya n'etu agụmagụ dị nakwa ịchọpụta akanka odee webatara n'iwepụta nkamma. A chọpụtara na atụmatụ okwu so n'ihe odee abụ ji ebupụta nkamma dị n'abụ ya, ma chọpụtakwa na odee abụ na-agbalị iwebata ụzọ atụmatụ okwu abụọ e nwere n'abụ. Nchọcha a ga-abara ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na ndị na-eme nchọcha uru n'ihi na ha ga-esi na ya, mere ihe mgbado ụkwụ n'ihe gbasara ememnchọcha. N'ezie, nchọcha a ga-enye aka n'ịkwalite agụmagụ ederede Igbo ọkachasi abụ ederede Igbo.
Keywords: Okwu Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ: Atụmatụ Okwu, Atụmatụ Okwu Maka Mkpụrụokwu, Atụmatụ Okwu Maka Ụdaolu, Abụ Ederede, Atụtụ Ọdịdị, Agụmagụ Ederede