Nchọcha a bų maka okwu agbamabuo na onodų ya n'asusu Igbo. Okwu agbamabuo nyere Umiedemede aka ime ka asusų Igbo burų ihe na-eto eto ma mee ka asusų bawanye abawaye. Asusu o bula nwere ebe o na-enyere ibe ya aka ma nwee ebe ya na ibe ya yiri n'otu uzo ma o bu n'uzo ozo. Ufodų n'ime ha bų ndį e ji akuziri umuaka įmų etu e si ekwu okwu ngwa ngwa ma mee ka akpa okwu umuaka bawanyekwuu n'uba. Ndį Igbo kwenyere na asusų bų nioala ndų ha n'ihi na onye kpoo oba ya mkpomkpo oba, agbataobi e were ya kpoo ntụ. Nchọcha a bụ n'uche iziputa okwu agbamabuo na onodu ya n'asusu Igbo. Nwanchocha mgbakwasara ukwų na atuty njieme na atuty nsinagburugburu. Nchocha ga-agbaso usoro nkowasi, The nwanchocha bų n'uche bų įkowaputa mputara okwundį a n'asusų Igbo, įchoputagasi okwu ufodu ndį na-agako onų ma nwee nghota zuru oke. Aro nchocha a bu na ndį nne na nna ga- enye aka ikųziri umuaka okwu abuo nwere otu nghota doro anya di na asusų Igbo. O ga- eme ka onodų azumaahja, agumakwukwo, alumdi na nwunye na omenala di iche iche gaa n'ihu. Ozo, ndį okenye ga-agba mbo iji asusų dį otu a were ekwu okwu tųmadį ebe umuaka no n'ogbako ndi ntoroobja. Nchocha a ga-abia n'isi njedebe site n'įchoputasi ihe ga-enyere ndį Igbo aka įga n'ihų ma mee ka ha burundi e ji asusų ha mara.
Keywords: Onodų, agbamabuo na asusų.