STUDIES IN RELIGION, SOCIETY AND HUMAN RELATIONS, 2024

NDỤMỌDỤ EGWU ALỤMALỤ NA MMETUTA YA NA NDỤ NDỊ NA-ABANYE N’ALUMDỊ NA NWUNYE N’ALA IGBO

Ann C. Onyekelu
Abstract

Egwu alụmalụ Igbo bụ egwu ndị ahụ ndị Igbo na-agụ maọbụ na-agba iji zipụta omenala ha site n’iji egwu ndị ahụ nye ndị na-abanye n’alumdi na nwunye ndụmọdụ. Egwu alụmalụ ọbụla nwere mpụtara ma nwekwa etu ha si emetuta na mmụọ nke mere na ndị Igbo na-akwanyere onye ọbụla ruru ilu nwanyị/di wee lụọ ugwu etu kwesiri. Nsogbu nchọcha a bụ na a chọpụtara na ọtụtụ ndị Igbo elegharala egwu alụmalụ e ji eziputa omenala Igbo anya n’ihi na ha aghọtaghị uru na ihe omimi dịgasi na ha. Ebumnobi nchọcha a bụ ka omeghe ọtụtụ ndị Igbo anya n’ihe gbasara ndụmọdụ dị n’egwu alumdi na nwunye site n’ịkọwapụta ụfọdụ egwu alumalụ Igbo, mpụtara ha na ndumọdụ ha. Nchọcha a ga-abara ndị Igbo niile uru ọkachasi ndị ihe dị n’egwu alụmalụ na-amasi. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’ala Igbo. Nwanchọcha ji atụtụ mmekorita omenala tuchaa nchọcha a. Nchọcha a bụ ụdị nchọcha nkọwa. A gbasoro usoro sovee wee mee nchọcha a site n’ịga n’ọba akwụkwọ dị iche iche nakwazi n’ịgba ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji nweta ngwaọrụ e jiri mee nchocha a. Nchocha a kọwapụtara ụfọdụ egwu alụmalụ Igbo dị iche iche ma chọpụta ndụmọdụ na mpụtara egwu ndị a. a chọpụtakwara uru egwu ndị a bara na ndụmọdụ ọ na-enye ndị na-abanye n’ọnọdụ alụmdi na nwunye. Nchọcha a turu aro ka ndị Igbo tinye uchu n’iji egwu alụmalụ Igbo ha na-enye ndị na abanye n’ọnọdụ alụmdi na nwunye ndụmọdụ kwesiri ekwesi ka alumdi na nwunye ha tọọ atọ.

Keywords: alụmalụ, egwu, igbo, mmetụta, na-abanye, ndi, ndụ, ndụmọdụ, nwunye, n’ala, n’alụmdi
Copyright © 2026 ACJOL.